N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi, Onye ọ bula nke kwere na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya. NDI ROM 10:11
KAM NNOGIDE N'IME JISOS
NDI FILIPAI 3:10-11 Ka m'we mara Ya, na ike nke nbilite-n'ọnwu-Ya, na nnwekọ nke ahuhu-Ya nile, n'ihi na anēme ka mu na Ya nwekọ otù udi n'ọnwu-Ya; ọ buru na uzọ ọ bula di m'gēsi ru isi na ndi nwuru anwu bilite.
CHINEKE ANAGHI EJIDE IWE RUE MGBE EBI-GHEBI
MAIKA 7:18 Ònye bu Chineke dika Gi, Nke nēbupu ajọ omume, nāgabiga kwa njehie nke diri ndi ala-nketa-Ya fọduru? O jigideghi iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu.
KPỌKUE JEHOVA O GA AZA GI
JONA 2:1-2 Jona we si n'afọ azù ahu kpere Jehova, bú Chineke-ya, ekpere. O we si, Esirim n'ahuhum kpọkue Jehova, O we zam; N'afọ ala-mọ ka m'siri tikue Ya, I nuru olum.
IKE MEGIDE AJONMUO
LUK 8:36-37 Ndi huru ya we kọrọ ha otú azọputara onye ahu ndi-mọ ọjọ ji. Ọra nile nke ala ndi Gerasa di ya gburugburu we kpere Ya ka O si n'ebe ha nọ la; n'ihi na ha nātu oké egwu: O we ba nime ub͕ọ, laghachi.
NMANYA AGWULA
JỌN 2:1-3 N'ubọchi nke-atọ ọlulu-nwunye di na Kena nke Galili; nne Jisus nọ kwa n'ebe ahu: ewe kpọ kwa Jisus, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, bia n'ọlulu-nwunye ahu. Mb͕e manya-vine kọrọ, nne Jisus we si Ya, Ha enweghi manya-vine.
EDEWO YA N'AKWUKWO SI
MATIU 4:7,10 Jisus siri ya, Ọzọ kwa edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi. Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.
EZI OSISI VAINI
JỌN 15:1-2 Mu onwem bu ezi osisi vine, Nnam bu kwa onye-ọlu-ubi. Alaka ọ bula nimem nke nādighi-ami nkpuru, O wepu ya: alaka ọ bula nke nāmi nkpuru, O nēme kwa ya ka ọ di ọcha, ka o we mia nkpuru kari.
OGBUGBA NDU NKE ANYI NA CHINEKE
JEREMAIA 31:33,35 N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gētiye iwum n'ime-ha, ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ya dika n'akwukwọ; M'gābu-kwa-ra ha Chineke, ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi: Otú a ka Jehova siri, bú Onye nēnye anyanwu ka ọ buru ìhè n'ehihie, na ukpuru nile nke ọnwa na nke kpakpando nile ka ha buru ìhè n'abali, Onye nēme ka oké osimiri dere du mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya:
Chineke Ebe Mgbabam
ABÙ ỌMA 11:1 Na Jehova ka m'b͕abàworo: Ùnu si aṅa si nkpuru-obim, Felaganu n'ugwu-unu dika nnunu?
Jizos bu uzom, eziokwu na ndum
JỌN 14:6 Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu.
Kraist Jizos Esiwo N'ili Bilie
LUK 24:1-7 Ma n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, n'oké isi-ututu, ha biaruru ílì ahu, nēbute uda utọ di iche iche nke ha doziri. Ha we hu nkume ahu na akpọrepuwo ya n'ílì. Ha we ba nime, ma ha ahughi aru nke Onye-nwe-ayi Jisus. O we rue, mb͕e ha nọ n'obi abua n'ihi nka, le, ndikom abua guzoro ha nso n'uwe nēb͕u àmùmà: ma mb͕e ha nātu egwu, nērube kwa iru-ha n'ala, ha si ha, Gini mere unu nāchọ Onye di ndu n'etiti ndi nwuru anwu? Ọ nọghi n'ebe a, kama emere ka O si n'ọnwu bilie: chetanu otú Ọ gwara unu okwu mb͕e Ọ nọ kwa na Galili, si, na aghaghi irara Nwa nke madu nye n'aka ndikom nēmehie emehie, na aghaghi kwa ikpọgide Ya n'obe, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.
Emeriela onwu
Matiu 27: 62-66. Ujo atukwala gi. Ihe obula nke tubara gi n'ili, were aja and uro nyachie ya. Dika ili tiwara Jizos aputa, otua ka ili ahu ga etiwa n'aha Jizos Amen. Ibu onye nmeri.
Ogwusi wo
JỌN 19:28-30 Mb͕e ihe a gasri, Jisus, ebe Ọ matara na ihe nile agwuwo ub͕u a, ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu, Ọ si, Akpiri nākpọm nku. Adọbara n'ebe ahu ite nke manya-vine b͕ara uka juru: ya mere ha were sponge nke manya-vine ahu b͕ara uka juru tukwasi n'elu osisi hyssop, che Ya n'ọnu. Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye.
Ncheta Onwu onye anyi: Ihere emere Kraist n'ihi anyi
MATIU 27:22-25 Pailat si ha, Ọ̀ bu gini ka m'gēme kwa Jisus Onye anākpọ Kraist? Ha nile si, Ka akpọgide Ya n'obe. O we si, É-è, n'ihi na Ò mere ihe ọjọ gini? Ma ha tibigara nkpu ókè, si, Ka akpọgide Ya n'obe. Ma mb͕e Pailat huru na okwu-ya abaghi n'ihe ọ bula, kama na ùzù nāputa, o were miri, kwọ aka-ya abua n'iru ìgwè madu ahu, si, Ikpé ọbara Onye ezi omume a amaghm: unu onwe-unu le nke ahu. Ndi-Ju nile we za, si, Ọbara-Ya di ayi n'isi, di kwa n'isi umu-ayi.
Ncheta Onwu onye anyi: Ahuhu Kraist huru n'ihi anyi
Luk 9:20-23 Onye nweayi tara ahuhu n'ihi anyi. Eledara ya anya ma jukwa ya. Dika omeriri Ekwensu, otua ka anyi ga emerikawa na aha Jizos. Amen
Ncheta Onwu onye anyi: Kraist Aja Ngabiga Anyi
1 Ndi Korint 5:7-8 Ka anyi hapu aja ochie ma buru ndi di ocha, n'hi na Christ achuwo aja ohuru n'ihi anyi.
Ncheta Onwu onye anyi: Opupu n'aka Fero
Opupu 12:30-36 Dika Chineke siri naputa umu Izrel n'aka Fero, otua ka Onyenweanyi Jesus Christ si anaputa anyi n'aka ihe ojo na nkpagbu.
Ncheta Onwu onye Nwe anyi: Nweda ala n'ume nke Christ
Jon 12:12-15 Hozanna diri Onye n'abia na aha nke Onye Nwe anyi.
Ncheta Onwu Onye nwe anyi: Iwedata onwe anyi ala
Jon13:4-5,12-15 Oburu na Onye nweanyi Jizos sachara ukwu ndi na eso uzo ya, kedu maka muna gi? Ya biko mere anyi ebere ka anyi hara inwe ngaga, ma buru ndi na sacha ukwu ibe anyi..
Ncheta Onwu Onye nwe anyi: Nzoputa puru iche
Jon 8:8-11 Onwu Jizos naputara anyi na amamikpe nke onwu. Ihunanya na obi ebere nka juru anya.
We depend on your generosity to keep distributing this book free by sending this link to as many people as you can for their free downloads.
Donating for printed copies to people who prefer hardcopies or in poorer countries where they do not have access to internet, especially where this book is being translated into other languages for free distribution.